1Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:2“Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu?Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.3Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa,gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?4Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị,a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị?Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?5“A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu;ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,6ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị,oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.7Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya;atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.8Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya;ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.9Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya,ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.10E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala,ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.11Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile,na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.12Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike;mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.13Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya;ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.14Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta yaduru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.15Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya;a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.16Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala,alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.17A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ,o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.18A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị,otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.19O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya,ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.20Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya;oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.21Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị,ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”