Job15ibo_bib

Okwu Elifaz

1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:2“Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi?Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?3Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka,maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?4Ma ị na-eleda ezi omume anyana-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.5Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa;ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.6Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m,egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.
7“Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ?A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?8Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke?Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?9Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị?Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?10Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị,ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.11Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta,ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?12Gịnị mere obi gị ji duhie gị,gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,13nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke,meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?
14“Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi,gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?15Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi,ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,16ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi,bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.
17“Gee m ntị ka m kọwaara gị;kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,18bụ ihe ndị amamihe kwuru,ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,19bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka hamgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.20Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ,bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.21Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị,mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.22O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị;mma agha nọ na-echere ya.23Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele;ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.24Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu,nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.25Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu,dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.26O ji ikwesi olu ike,dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.
27“Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya,abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,28ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi,nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha,ụlọ nke na-adakasị adakasị.29Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa.Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.30Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị,ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ,iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.31Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu,nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.32Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju,ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ33Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha,dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.34Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga,ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.35Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume;naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”