Job11ibo_bib

Okwu Zofa

1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:2“Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a?A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?3Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị?Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?4Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ,adịkwa m ọcha nʼanya gị.’5Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu,na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.6Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe,nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ.Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.
7“I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke?I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?8Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime?Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma?9Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa,dị obosara karịa oke osimiri.
10“Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ,kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?11Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie,mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?12Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihenaanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.
13“Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya,setịpụ aka gị abụọ nye ya,14ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka,ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị15mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị,ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.16Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị,na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.17Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie,ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.18Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị;ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.19Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla,ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.20Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada,ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ;olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”