Jeremaya47ibo_bib

Ozi e ziri banyere ndị Filistia

1Okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.
2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu;ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke.Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya,ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya.Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa,mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.3Mgbe ha ga-anụ ụzụ ikiri ụkwụ nke ọtụtụ ịnyịnya, nke na-agbata ọsọ na-abịa nʼebe ha nọ,mgbe ha ga-anụkwa ụzụ ụgbọ agha ndị iro,na ụzụ nzọ ụkwụ igwe ha.Nʼoge ahụ, ndị bụ nna agaghị enwe ike nyere ụmụ ha aka,nʼihi na aka ha ga-akụda nʼakụkụ ha.4Nʼihi na ụbọchị ahụ abịalamgbe a ga-ebibi ndị Filistia niile,mgbe a ga-ebipụ ndị niile fọdụrụ,ndị nwere ike inyere obodo Taịa na Saịdọn aka.Nʼihi na Onyenwe anyị akwadoola ibibi ndị Filistia,o kwadoola ibibi ndị ahụ fọdụrụ nʼọnụ mmiri Kafto.5Gaza ga-akpụcha isi ya nʼọnọdụ iru ụjụ.A ga-eme ka Ashkelọn dere duu.Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-egbukasị onwe unu ahụ,unu bụ ndị fọdụrụ afọdụ bi nʼala dị larịị?
6“ ‘Ewoo, gị mma agha Onyenwe anyị,ole mgbe ị ga-ezu ike?Mịnye onwe gị nʼọbọ gị,kwụsị ịkpa ike gị ma dere duu.’7Ma ọ ga-esikwanụ aṅaa zuru ike,ebe ọ bụ Onyenwe anyị nyere ya iwuibu agha megide Ashkelọn,na ndị bi nʼọnụ mmiri oke osimiri?”