Jeremaya3ibo_bib
1“Ọ bụrụ na nwoke agbaara nwunye ya alụkwaghị m,nwanyị ahụ ahapụ ya pụọ ga lụrụ nwoke ọzọ,di mbụ ya ahụ, o kwesiri ịlaghachi ka ọ lụọkwa ya ọzọ?Ọ bụ na agaghị emerụ ala ahụ nke ukwuu?Ma unu ebiela ndụ dịka ndị akwụna nwere ọtụtụ ndị iko,ọ bụ ugbu a ka unu ga-alaghachikwute m?”otu ka Onyenwe anyị kwupụtara.2“Welie anya gị abụọ ma lee ebe niile nke dị elu nke ọhịa na-adịghị nʼala a,olee ebe gị na ndị ikom na-edinakọbeghị nʼịkwa iko?Ị na-anọ nʼakụkụ ụzọ niile na-eche ndị iko,na-anọkwa dịka onye Arebịa nʼọzara.Ị werela ịkwa iko gị niilena ihe ọjọọ gị merụọ ala a.3Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu,ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị.Nʼihi na unu bụ ndị akwụna,ndị ihere na-adịghị eme.4Ọ dịbeghị anya mgbe unu kpọrọ m, sị m,‘Nna m, ị bụ enyi m kemgbe m dị na nwantakịrị.5Iwe gị ọ ga-adịgide mgbe niile?Iwe gị dị ọkụ ọ ga-adịgide ebighị ebi?’Otu a ka unu si ekwu okwu,ma unu nọgidesịrị ike na-eme ihe ọjọọ niile unu nwere ike ime.”