Jeremaya15ibo_bib

1Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ.2Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ,ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu;ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu,otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’3“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.4Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?6Gị onwe gị ajụla m,”ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa hanʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.8Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri.Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibibịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha;na mberede ka m ga-eme ka nhụju anyana ihe oke egwu bịakwasị ha.9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,kubie ume.Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọsite na mma agha ndị iro ha.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m,onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu.O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego,ma mmadụ niile na-akọcha m.11Onyenwe anyị kwuru sị,“Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe,aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọnʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.
12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe,ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?
13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị,nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla.Nʼihi na mmehie gị niileejupụtala nʼala a niile.14Aga m ewere gị nye ka ị bụrụ ohu ndị iro gị.Ị ga-ebi nʼala ị na-amaghị.Nʼihi na a ga-esite nʼiwe m mụnye ọkụnke ga-eregbu gị.”
15Ị maara O Onyenwe anyị,ya mere cheta m, lekọtaakwa m.Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị.16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị,Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.19Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,ime ka i guzokwa nʼihu m.Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzuị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.Ndị a ga-alaghachikwute gịma i gaghị alaghachikwuru ha.20Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo.Ha ga-ebuso gị agha,ma ha agaghị emeri gịnʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị,nakwa ịzọpụta gị,”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.21“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ.Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”

No translations available.