1Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke rutere Jeremaya banyere ụkọ mmiri.2“Juda na-eru ụjụ,ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya.Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ,ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.3Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri.Ha na-aga nʼolulu mmirima o nweghị mmiri ha na-achọta.Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta.Ha ji aka ha kpuchie isi hanʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.4Ala na-agbawanʼihi enweghị mmiri ozuzo.Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi hanʼihi obi ọjọọ ha.5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa,na-ahapụ nwa ọhụrụ ya,nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị.6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị.Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa;anya ha adabamiela ha nʼisinʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”7Ọ bụ ezie na mmehie anyị na-agbagide anyị ama,Onyenwe anyị, biko rụọ ọrụ gị nʼihi aha gị.Anyị emehiela megide gị.Ndaghachi azụ anyị site nʼebe ị nọ dịkwa ukwuu.8Gị, onye bụ olileanya Izrel.Onye Nzọpụta ya nʼoge ahụhụ,gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ọbịa nʼala a,dịka onye ije nke na-anọ naanị ọnọdụ otu abalị?9Gịnị mere i ji nọdụ dịka onye ihe mere na mberede,dịka dike nke na-enweghị ike ịzọpụta?Onyenwe anyị, ị nọ nʼetiti anyị;ọ bụkwa aha gị ka a kpọkwasịrị anyị.Ahapụkwala anyị!10Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a,“Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu.Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe.Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ.Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha,ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”11Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ekpela ekpere nʼihi ọdịmma ndị a.12Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”13Ma asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Lee na ndị amụma na-asị ha, ‘Unu agaghị ahụ mma agha anya, maọbụ hụ ahụhụ nke ụnwụ na-eweta, nʼeziokwu, aga m enye unu udo nke na-adịgide adịgide nʼebe a.’ ”14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara.15Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma nʼaha m. Ọ bụghị m ziteere ha, ma ha nọgidere na-asị, ‘Mma agha na ụnwụ enweghị ike ịbịaru ala a nso.’ Ndị amụma a niile ka a ga-ebibi site na mma agha na ụnwụ.16A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.17“Gwa ha okwu ndị a,“ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-erudaehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị,nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke,ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu,ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ.18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodoana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo;Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu,ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara.Ma onye amụma ma onye nchụajaagaala nʼala nke ha amaghị.’ ”19Ị jụla Juda kpamkpam?Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ?Gịnị mere i ji tigbuo anyịruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị?Anyị lere anya udo,ma ọ dịghị ezi ihe bịara;anyị lere anya ọgwụgwọ,ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu.20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị,na ikpe mara nna nna anyị ha;nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.21Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị.Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ.Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara;emebikwala ya.22Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo?Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị?Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a.Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị,nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.