JER13ibo_bib

Ihe ike nʼukwu13:1 Maọbụ, ihe mgbado ukwu

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, zụta mgbado ukwu akwa ọcha nke a na-eke nʼukwu. Ị zụtachaa ya, kekwasị ya nʼukwu gị. Ma ekwekwala ka o metụ na mmiri.”2Ejere m zụta ajịahụ dịka Onyenwe anyị kwuru, kee ya nʼukwu m.3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ, sị m,4“Were ajị ahụ ị zụtara, nke i kekwasịrị nʼukwu gị, bilie, jee nʼosimiri Yufretis. I ruo, zoo ihe okike ukwu ahụ na mgbawa nkume dị nʼebe ahụ.”5Ya mere, apụrụ m, jee, zoo ya na Yufretis dịka Onyenwe anyị gwara m.6Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Bilie, jeghachi Yufretis. I jeruo, wepụta ajị ahụ m sị gị zoo nʼebe ahụ.”7Ya mere, agara m Yufretis, gwupụta ajị ahụ site nʼebe m zoro ya, ma mgbe m wepụtara ya, ahụrụ m na o mebiela, na ọ bakwaghị uru ọbụla.8Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,9“Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼotu aka ahụ, mụ onwe m ga-ebibi mpako Juda na oke mpako Jerusalem.10Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla.11Nʼihi na dịka belịt mmadụ kere nʼukwu ya si arapara ya nʼukwu, otu a ka m si mee ka ụlọ Izrel niile, na ụlọ Juda niile rapara m nʼahụ,’ ime ka ha ghọọ ndị m, ndị a ga-esite na ha bulie aha m elu, nye m otuto na nsọpụrụ. Ma ha ajụla ige ntị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Karama mmanya akpụkpọ

12Sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: A ga-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya. Ọ bụrụ na ha sị gị, ‘Ọ bụ na anyị amaghị na a na-agbaju karama akpụkpọ ọbụla mmanya?’13Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem.14Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Ịdọ aka na ntị banyere ịdọta nʼagha

15Nụrụnụ, geekwanụ ntị,unu ebulila onwe unu elu,nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.16Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ.Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu;tupu unu akpọbie ụkwụ ununʼelu ugwu gbara ọchịchịrị.Unu na-ele anya ìhèma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị.Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ.17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị.Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwanʼihi mpako unu.Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta;anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuunʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.
18Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha,“Sitenụ nʼocheeze unu rịdata,nʼihi na okpueze ọma unuga-esi nʼisi unu dapụ.”19A ga-emechi obodo niile nke Negeb.Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha.A ga-adọtakwa Juda niile nʼaghaburu ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.
20Welienụ anya unuka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa.Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ,igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?21Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụdịka ndị enyi gị bịa buso gị agha?Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gịọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?22Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị,“Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?”Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gịka e ji dọwaa uwe mwụda gị,merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.23Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya?Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa?Nʼụzọ dị otu a kwa,unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.
24“Aga m efesasị unu dịka ahịhịa ọka kpọrọ nkụ,nke oke ifufe si nʼọzara na-ebugharị.25Nke a bụ ihe unu fetara na nza,oke nke m kwadoro si nʼaka m inye unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.“Nʼihi na unu echefuola m,tụkwasị obi unu na chi okwu ụgha dị iche iche.26Ya mere, aga m ekpughepụ uwe i yi nʼahụ, jiri ya kpuchie gị ihu,si otu a gbaa gị ọtọ. Ihere ga-emekwa gị.27Mgbe ahụ, ịkwa iko gị niile ga-apụta ihe ya na agụụ ihe ọjọọ niile na-agụ gị,na ọnọdụ enweghị ihere nke ịgba akwụna gị niile!Nʼihi na ahụla m omume rụrụ arụ gị niile,nke ị na-eme nʼelu ugwu, na nʼime ọhịa.Ahụhụ dịrị gị, Jerusalem!Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide nʼime adịghị ọcha gị?”