Aịzaya60ibo_bib

Ebube nke Zayọn

1“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala,ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ.2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile,oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa,ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gịebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị,ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midiana Efaa ga-ejupụta nʼala gị,ma ndị sikwa nʼobodo Shebaga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda.Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị.A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m.Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.
8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii,ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere;ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ,na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya,ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile.Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ,Onye nsọ nke Izrel,nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị.
10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niilesite nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ,ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche.A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi;a ga-ekpochapụ ha.
13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị.Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres,ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma.Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị.Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ.Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị,Zayọn nke Onye nsọ Izrel.
15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu,onye mmadụ niile na-eweda nʼala,ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi;ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche,ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị.Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gịna Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.17Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo,nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha.Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla,nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe.M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gịezi omume ga-abụ onye na-achị gị.18Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ.Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa.Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta,ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.19Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ,maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe,nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi,Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.20Anwụ gị agaghị ada ada,ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha;nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile,iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.21Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume,ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi.Ha bụ ome nke m kụrụ,bụ ọrụ aka m,ime ka ịma mma m pụta ìhè.22Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo,mba nta ga-aghọ obodo buru ibu.Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”