Aịzaya57ibo_bib
1Ndị ezi omume na-ala nʼiyi,ma ọ dịghị onye ọbụla na-etinye ya nʼobi;a na-ewezuga ndị ji obi ha niile na-efe Chineke,ma ọ dịghị onye na-aghọta,na-ewezugara onye ezi omumepụọ nʼihu ihe ọjọọ.2Ndị na-agazi agazi nʼụzọ hana-abanye nʼudo.Ha na-enwekwa izuike mgbe ha dinara nʼọnwụ.3“Ma unu onwe unu, bịanụ nʼebe a, unu ụmụ ndị mgbaasị,unu ụmụ ndị na-akwa iko, na ụmụ ndị akwụna.4Onye ka unu na-akwa emo?Onye ka unu na-akọcha,na-arapụtakwara ire unu?Unu ọ bụghị ụmụ ndị nnupu isi,mkpụrụ ndị na-ekwu okwu ụgha?5Unu na-emejupụta ihe ọjọọ niile na-agụ obi unu agụụmgbe unu zukọrọ na-efe arụsị unu nʼokpuru osisi ook ọbụla.Unu na-ewerekwa ụmụ unu chụọ ajana ndagwurugwu niile, na nʼokpuru nkume niile dị elu.6Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ,nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere.E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niilena onyinye mkpụrụ ọka unu niile.Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?7Ọ bụ nʼelu ugwu dị elu ka unu doziiri onwe unu ihe ndina,nʼebe ahụ kwa ka unu gara chụọ aja unu.8Ọ bụkwa nʼazụ ọnụ ụzọ niile, na ibo ụzọ niile,ka ị kwụbara oyiyi arụsị gị.Ị gbakụtara m azụ,yipụ uwe gị rịbanye nʼime ihe ndina gị,ebe gị na ndị ahụ ị hụrụ nʼanya dinakọrọ,imejupụta ihe ọjọọ ahụ na-agụ obi gị agụụ.9Ị were mmanụ jekwuru Molekmeekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba.Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya;ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ.10Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị,ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’Ị chọtara ntute nye ndụ gị,ya mere, na ị daghị mba.11“Onye na-emenye gị ụjọ na egwu dị otu a?Nke mere na ị dịghị agwa m eziokwu?Ị naghị echetakwa m,ị naghị atụgharịkwa ihe banyere m nʼobi gị?Ọ bụ nʼihi na m gbara nkịtị oge ndị a niileka i ji hapụ ịtụ m egwu?12Lee, aga m ekpughe ezi omume gị na ọrụ ọma gị,igosi gị na ihe ndị a ị gụrụ dị ka ezi ihe agaghị enyere gị aka.13Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka,ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị.Ikuku ga-eburu ha niile bufuo,naanị otu nkuume ga-ekutu ha.Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụga-eketa ala ahụ;ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”