1Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị.Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa.Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya,na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.2Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe,iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile.Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam,nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.3Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ.Ozu ha ga-esikwa isi.Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze,a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ,kpakpando niile ga-adadịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ,dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe,lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm,ndị m mara ikpe mbibi.6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara,abụba kpuchikwara ya,ọbara ụmụ atụrụ na mkpina abụba sitere nʼakụrụ ebulenʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra.O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa,ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta.Ala ga-ejupụta nʼọbara ha.Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ.Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii,uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ),ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie;anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi.Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya,ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ.Chineke ga-eseti nʼelu Edọm,eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara,na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze.Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile;ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu,ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịana nke ikwighịkwighị.14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ.Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa.Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha,chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ.Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya,lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha.Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa,nke ọbụla na ibe ya.16Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime:Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu.Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya,nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a.Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.17Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ,jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ.Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi,nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.