1Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile:Anyị nwere obodo e wusiri ike.Chineke na-eme ka mgbidi yana ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.2Meghee ụzọ ama niile,ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata,e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi.3Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ikenwee udo zuruoke,nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.4Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile,nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.5Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala,na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala.Mgbidi yaka ọ na-eme ka ọ daruo ala.6Ọ na-enyefe obodo ahụnʼaka ndị a na-emegbu emegbu,na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ.7Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu,gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị.8E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,na-ele anya gị.Aha gị na ihe niile e ji mara gịbụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.9Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpeka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọadịghị eme ka ha gbanwee.Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ.Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.11Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu,ha adịghị ahụ ya.Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha.E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.12Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo;nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.13O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche,ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;e chefukwaala ha.15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị;i meela ka mba a saa mbara.I wetarala onwe gị nsọpụrụ,i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.16Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị.Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha,ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.17Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa,dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu.Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.18Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze,ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya.Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka.O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.19Ma ndị gị niile nwụrụ anwụ ga-adị ndụ, O Onyenwe anyị.Ozu ha ga-esite nʼọnwụ bilie.Unu ndị niile bi nʼajatetanụ ma tie mkpu ọṅụ.Nʼihi na igirigi gị dị ka igirigi nke ụtụtụ,ala ga-amụpụtakwa ndị ya niile nwụrụ anwụ.20Baanụ nʼụlọ, ndị m,kpọchienụ ụzọ unu!Zoonụ onwe unu naanị nwa oge nta,tutu ruo mgbe iwe Chineke ga-agabiga.21Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi yana-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile.Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya,ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.