Aịzaya25ibo_bib

Toonu Onyenwe anyị

1O Onyenwe anyị, ị bụ Chineke m;aga m ebuli gị elu, nye aha gị otuto,nʼihi na site na ntụkwasị obi zuruoke,ị rụọla ọtụtụ ihe ịrịbama,nke i tụrụ atụmatụ ha siterị nʼoge gara aga.2Nʼihi na i meela ka obodo ghọọ mkpọmkpọ ebe;mee ka obodo e wusiri ike ghọọ ebe dakpọrọ adakpọ;meekwa ka ebe siri ike nke ndị mba ọzọ ghọọ ebe obodo na-adịghịzi,agaghị ewukwa ya ruo mgbe ebighị ebi.3Nʼihi nke a, ndị niile dị ike ga-asọpụrụ gị.Obodo ndị ahụ na-emenye ndị mba ọzọ egwu ga-atụ gị egwu.4Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba;ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha,ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo,na ndo nʼoge okpomọkụ.Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ eberedị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi,5dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara.Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị,dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ,otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị.
6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niilega-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri.Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile.Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ,nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile,nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niilesite nʼihu mmadụ niile,ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niiledakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.Onyenwe anyị ekwuola ya.9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,“Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”
10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a,ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha,dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.11Ha ga-agbasa aka ha abụọ nʼime ya,dịka onye na-egwu mmiri si agbasapụ aka ya,ma Chineke ga-eweda mpako ha niile,nʼagbanyeghị ọrụ aghụghọ niile nke aka ha.12Ọ ga-akwatu mgbidi gị niile dị elu nke e wusiri ike,mee ka ha daruo ala,ọ ga-eme ka ha daruo ala,ruo mgbe ha ghọrọ uzuzu.