1Nke a bụ amụma megide Babilọn nke Aịzaya nwa Emọz hụrụ.2Welienụ ọkọlọtọ agha nʼelu ugwu tọgbọrọ nʼefu.Kpọkuonụ ndị agha.Feerenụ ha aka,ka ha site nʼọnụ ụzọ ama nke ndị a maara aha ha bata nʼime obodo ukwu ahụ na-anya isi.3Enyela m ndị m kwadoro maka agha iwu;akpọọla m ndị ọka agha m oku, bụ ndị na-aṅụrị ọṅụ na mmeri m, ka ha gosipụta oke iwe m.E, ndị m kpọrọ bụ ndị ahụ na-aṅụrị ọṅụ ịhụ na m meriri ndị iro m.4Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile;gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme.Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche.Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe.Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niilena-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.5Ha si nʼobodo dị iche iche, nke dị anyana nke dị na nsọtụ ụwa na-abịa.Ha bu ngwa agha na-egosi oke iwe Onyenwe anyịna-abịa imebi ala ahụ niile.6Kwasienụ akwa ike nʼihi na ụbọchị Onyenwe anyị dị nso,ụbọchị ahụ oke mbibi ga-esi nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile bịara unu.7Nʼihi nke a, aka ndị mmadụ ga-ada mba,obi ga-alọkwa ndị mmadụ mmiri.8Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu.Ahụ mgbu ga-abịakwasị hamee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme.Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme.Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.9Nʼihi na lee, ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa,ụbọchị nke obi ebere na-agaghị adịkwa, ụbọchị iwe na oke ọnụma.A ga-ekpochapụ ala ahụ,ya na ndị mmehie niile dị nʼime ya.10Nʼihi na kpakpando niile nke eluigwe na kpakpando ndị ọzọ gbara ha gburugburuagaghị egosipụta ìhè ha.Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị nʼọwụwa yaọnwa agakwaghị enye ìhè ya.11Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya,taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha.Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa,ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.12Aga m eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha,ha ga-akọ ụkọ karịa ọlaedo si Ọfịa.13Nʼihi na m ga-eme ka eluigwe maa jijiji,meekwa ka e wezuga ụwa site nʼọnọdụ ya,nʼihi oke iwe ga-ewe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.Ha ga-emezu nʼụbọchị ahụ ọ ga-ezipụta oke iwe ya dị ọkụ.14Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nʼime ha ga-eche ihu ya nʼụzọ gawara ebe ndị ya nọ.Ha ga-agbarakwa ọsọ laghachi nʼala nke aka hadịka mgbada na-agbanarị ndị na-achụ nta,maọbụ ụmụ atụrụ ndị na-enweghị onye na-azụ ha.15Onye ọbụla e jidere nʼime ha ka a ga-amapu afọ,onye ọbụla nke e jidere ka a ga-eji mma agha gbuo.16A ga-etipịa ụmụ ha na-aṅụ ara nʼihu ha;a ga-anapụ ha ụlọ ha, merụkwaa ndị nwunye ha.17Nʼihi na lee, aga m eme ka ndị Midia pụọ imegide ha;ọ dịkwaghị ọlaedomaọbụ ọlaọcha ha pụrụ iji megharịa ha anya.18Ha ga-eji ụta ha gbatusịa ụmụ okorobịa;ha agaghị emekwara ụmụntakịrị ebere,maọbụ gosi ụmụ na-etopụta etopụta obi ebere.19Babilọn, bụ ọla mma nke alaeze niile,ịma mma na ebube ndị Kaldịa,mgbe Chineke ga-akwatu yaọ ga-adị ka Sọdọm na Gọmọra.20Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.Site nʼotu ọgbọ ruo nʼọgbọ ọzọ ndị mmadụ agaghị ebi nʼime ya.Ọ dịghị onye Arebịa na-ejegharị ejegharị ga-ama ụlọ ikwu ya nʼime ya;ndị ọzụzụ atụrụ agaghị ekwe ka atụrụ ha makpuru nʼebe ahụ.21Ọ ga-abụ ebe obibi nye anụ ọhịa niile bi nʼọzara.Ụlọ dị nʼebe ahụ ga-abụkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa,na ikwighịkwighị,nʼebe ahụ kwa ka ụmụ mkpi ọhịa ga na-awụgharị.22A ga-anụkwa ụda akwa anụ ọhịa, na ịgbọ ụja nkịta ọhịa nʼime ụlọ ha niile e wusiri ike.Nkịta ọhịa ga-ebikwa nʼime ụlọ ọma niile dị nʼebe ahụ.Lee na oge ha ji emezu adịla nso,a gaghị emekwa ka oge imezu ihe ndị a dị anya.