1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel;nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unulọghachikwute Onyenwe anyị.Gwanụ ya sị,“Gbaghara mmehie anyị niile,jirikwa ihuọma nabata anyị,ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị,ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị.Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa,nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha,jiri obi m niile hụ ha nʼanya,nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi.Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili.Dịka osisi sida nke Lebanọn,mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;6ome ya ga-awasa,ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv,isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn.7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m.Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ.Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị,a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ?Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya.Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ.Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a.Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara.Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ.Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha,ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.