Hosiya13ibo_bib

Iwe Chineke megide Izrel

1Na mbụ, mgbe ọbụla Ifrem kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji,nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼIzrel.Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere Baal, ọ nwụkwara.2Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie,ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche,nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma,ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka.Ha onwe ha na-ekwu,“Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ.Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ”3Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ,maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa,dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka,dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ.
4“Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na Chineke gị,siterịị nʼala Ijipt.Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m.Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m.5Elekọtara m unu nʼime ọzara,nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị.6Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ.Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga,chefuo m.7Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm;maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ.8Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya,dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi haaga m eripịa ha dịka ọdụm,anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha.
9“Aga m ala gị nʼiyi, gị Izrel,onye pụrụ inyere gị aka?10Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị?Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ,bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị,‘Nye m eze na ndị ọchịchị’?11Esitere m nʼiwe m nye gị eze,sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya.12Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe;a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.13Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya;maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche.Mgbe oge ya zuru,ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya.
14“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ.Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ.Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị?Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị?“Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla,15ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile.Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke Onyenwe anyị zitere,ga-esi nʼọzara fekwasị ya.Isi iyi niile ga-ata,olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa.A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile,na akụ niile o nwere.16Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya,nʼihi na o nupuru isi megide Chineke ha.A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile,tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala,jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”