Ndị Hibru8ibo_bib

Onyeisi nchụaja nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ

1Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.2Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya.3A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka ọ nwee ihe ọ ga-eji na-achụ aja.4A sịkwarị na ọ nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị.5Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.”6Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.7Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ.8Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị,“Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara,mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụdịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,nakwa ụlọ Juda.9Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụmụ na nna nna ha gbara,mgbe m jidere ha nʼakasite nʼala Ijipt dupụta ha,nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m.Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ,ka Onyenwe anyị kwupụtara.10Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel,mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.Aga m etinye iwu m nʼime uche ha,dekwasị ya nʼobi ha.Aga m abụ Chineke ha,ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.11Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.12Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”13Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.