Izikiel30ibo_bib

Abụ akwa nʼihi Ijipt

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,“ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị,“Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso,ụbọchị igwe ojii,ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,ihe mgbu ga-adakwasị Kush.Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.5Kushna Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:“ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.Site na Migdol ruo nʼAswan,ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.8Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.9“ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.
10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,“ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọnbibie igwe ndị agha Ijipt niile.11Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.Aga m etinye ọkụ na Zoan,ma taa Tibs ahụhụ.15M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m,bụ ebe siri ike nke Ijipt,m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.A ga-eji ike tipịa Tibs.Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubastiga-anwụ site na mma agha.Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhismgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.Igwe ojii ga-ekpuchi ya,a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Aka Fero agbajiela

20O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.23Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,24meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ.25Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt.26Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”