1“Ma gị onwe gị, bụọrọnụ ndịisi Izrel abụ akwa a,2ma kwuo,“ ‘Ụdị nne Ọdụm gịnị ka nne gị bụnʼetiti ụmụ ọdụm.Ọ dinara nʼetiti ha,na-azụ ụmụ ya.3Ọ zụlitere otu nʼime ụmụ yanke ghọrọ nwa ọdụm siri ike.Ọ mụtakwara ka e si adọrisi anụ ọhịa,ghọọ ọdụm na-eri mmadụ.4Mba niile nụrụ maka ihe banyere ya,mee ka ọ danye nʼolulu ha gwuru.Ha ji nko koro ya,duru ya gaa nʼala Ijipt.5“ ‘Mgbe ọ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe ọzọ o nwere ike ime banyere ọnọdụ ahụ,matakwa na olileanya ya abụrụla ihe efu,ọ họpụtara nwa ya ọzọkuziere ya otu ọ ga-esi bụrụ ọdụm dị ike.6Ọ ghọrọ onyeisi ụmụ ọdụm niile,nʼihi na ọ bụ ọdụm siri ike,ọ mụtakwara ka e si ejide anụ ọhịa,ya onwe ya ghọkwara ọdụm na-eri mmadụ.7O tikpọrọ ebe ha niile e wusiri ikemeekwa obodo ha niile mkpọmkpọ ebe.Ala ahụ na ndị niile nọ nʼime ya,mara jijiji site nʼoke egwu nʼihi olu ịgbọ ụja ya.8Mgbe ahụ, ndị agha nke mba niile dị iche ichepụtara gbaa ya gburugburu.Ha sitere nʼakụkụ niile nwude yanʼọnya olulu ha siiri ya.9Ha tinyere ya nko nʼimi, were dọkpuo ya nʼụlọ igwe a kpara akpa,bute ya nʼihu eze Babilọn.E mere ka o biri na mba ọzọ dịka ohu,ka a ghara ịnụ ụda olu ya ọzọnʼugwu niile nke Izrel.10“ ‘Nne gị dịka osisi vaịnị nʼogige vaịnịa kụrụ nʼakụkụ mmiri,nke nwere ọtụtụ alaka, nke na-amịkwa mkpụrụnʼihi mmiri ọ na-enweta.11Alaka ya niile siri ike,ha topụtara ghọọ mkpara eze.O topụrụ etopụ,tokarịa alaka ndị ọzọ elu.Nke a mere e ji na-ahụ ya anyasite nʼebe dị anya.12Ma e ji oke iwe hopu yatụpụ ya nʼala.Oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ mere ka akwụkwọ ya kpọnwụsịa,meekwa ka mkpụrụ ya daa.Alaka ya ndị ahụ dị ike kpọnwụsịrị,ọkụ rechapụkwara ha niile.13Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzaraebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.14Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka yana mkpụrụ ya niile.Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụnke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”