Ọpụpụ25ibo_bib
Onyinye maka owuwu ụlọ nzute
1Onyenwe anyị gwara Mosis sị,2“Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.3“Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha:“ọlaọcha, ọlaedo na bronz.4Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha, na nke ajị ewu;5akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia;6mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;7nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd,na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.8“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha.9Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.