Ekiliziastis6ibo_bib

1Ọ dị ihe ọjọọ ọzọ nke m hụrụ nʼokpuru anyanwụ, nke na-anyịdo ụmụ mmadụ.2Chineke na-enye mmadụ akụnụba, na ihe nnweta, na nsọpụrụ, na-emekwa ka ha nwee ihe niile ha chọrọ, ma ọ dịghị enye ha ike ịnụ ụtọ ha; ma onye ọzọ na-anụ ụtọ ha. Nke a bụ ihe efu, bụrụkwa ihe jọgburu onwe ya.3Mmadụ nwere ike mụta narị ụmụ, o nwekwara ike nwee ndụ ogologo ruo agadi, ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịnụ ụtọ akụnụba ya, ọ bụrụkwa na o nwetaghị ụdị olili ruru ya, ana m asị, na nwa nwụrụ nʼafọdị mma karịa ya.4Ọbịbịa ya e nweghị isi, nʼọchịchịrị ka ọ na-ala, ọ bụkwa ọchịchịrị ka e kpuchiri aha ya.5Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ.6A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala?7Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ,ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.8Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu?Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenyena ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?9Ihe eji anya hụka mma karịa oke ọchịchọ!Nke a bụkwa ihe efuna ịchụso ifufe.
10Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga.Amakwaara ihe mmadụ bụ,mmadụ ọbụla apụghị ịlụsoonye ka ya ike ọgụ.11Okwu na-aba ụba,nghọta na-adị nta.O nwere uru nke a bara?12Onye mara ihe dịrị mmadụ mma na ndụ, nʼụbọchị ole na ole nke na-abaghị uru o nwere ịgabiga ndụ a dịka onyinyo? Onye pụrụ ịgwa ya ihe ga-eme nʼokpuru anyanwụ, mgbe ọ nwụsịrị?