Ekiliziastis12ibo_bib
1Ya mere, cheta Onye kere gịmgbe ị ka bụ okorobịa,tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,na mgbe afọ aka abịarubeghịmgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”2Tupu anyanwụ na ìhè,ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala,mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ,ma abụ ha niile na-ala ala,5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;na ihe egwu nke okporoụzọ,mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifurumgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ,agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa.Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya,ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,tupu ite adawaa nʼisi iyi,tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru.“Ihe niile bụ ihe efu!”