Ekiliziastis10ibo_bib
1Ijiji nwụrụ anwụ ga-eme ka mmanụ isi ụtọ sie isi ọjọọ.Otu a kwa, nzuzu nta pụrụ ime ka amamihe dị ukwuu ghara inwe nsọpụrụ.2Obi onye maara ihe na-eme ka o mee ihe ziri ezi,ma obi onye nzuzu na-eduba ya na mmehie.3Ị ga-ama onye nzuzu site nʼije ụkwụ ya,nʼihi na o maghị ihe.Ọ bụladị onye ọbụla na-achọpụta onye nzuzu ọsịịsọ.4Ọ bụrụ na iwe onye ọchịchị ebilie megide gị,ahapụla ọnọdụ gị,nʼihi na mmụọ dị nwayọọ ga-eme ka mmehie ukwu dị iche iche dajụọ.5Ọ dịkwa ihe ọjọọ ọzọ m hụrụ nʼokpuru anyanwụ,dịka njehie nke ndị eze na ndị na-achị achị na-ejehie.6Ahụrụ m ka ndị nzuzu na-enweta ọkwa dị elu,ma ndị ọgaranya adịghị enweta ọnọdụ ruuru ha.7Ahụla m ka ohu na-agba ịnyịnya,ma ụmụ eze ji ụkwụ na-aga dịka ụmụ ohu.8Onye gwuru olulu ga-adaba nʼime ya!Onye na-etida mgbidi ka agwọ ga-atagbu.9Onye na-arụ ọrụ nʼebe a na-awa nkume ka nkume ga-adakwasị.Onye na-awa nkụ nọ nʼize ndụ site na ha.10Ọ bụrụ na anyụike adịghị nkọ,ọ bụrụkwa na-amụghị ihu ya amụ,a ga-etinye ike karịa,ma ịma eme ihe na-eme ka ihe gazie agazi.11Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu e kechie ya ọnụ,ọ dịkwaghị uru ọ bara na e kechiri ya ọnụ.12Okwu onye maara ihe na-ejupụta nʼamara,ma okwu onye nzuzu na-eduba ya nʼịla nʼiyi13Nʼihi na mmalite okwu ya bụ nzuzu,ọgwụgwụ okwu ya bụkwa naanị mmebi iwu na ịyị ara.14Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.Ma o nweghị onye ma ihe na-aga ime,onye pụrụ ịgwa ya ihe gaje ime mgbe ọ nwụrụ?15Ọrụ nke ndị nzuzu na-agwụ ya ike,ha makwaghị ụzọ ijeru obodo.16Ahụhụ ga-adịrị ala nke eze ya bụ nwantakịrị,nke ndị na-achị achị bụ ndị na-akpọ oriri nʼụtụtụ.17Ngọzị na-adịrị ala ahụ nke eze ya bụ onye a na-asọpụrụ,nke ụmụ eze ya na-eri ihe mgbe o kwesiri nʼihi inweta ike,ọ bụghị maka ịṅụbiga mmanya oke.18Ọ bụ umengwụ na-eme ka ụlọ hie mmiri;ọ bụkwa umengwụ na-eme ka elu ụlọ malite ize eze.19Ịkpọ oriri na-eweta ọnụ ọchị,mmanya na-enye obi ụtọ,ma ego bụ ọsịsa nye ihe niile.20Akọchala eze, ọ bụladị nʼechiche obi gị ;maọbụ bụọ ọgaranya ọnụ nʼime ụlọ ndina gị,nʼihi na anụ ufe nọ nʼelu nwere ike buru okwu gịnwa nnụnụ nwere nku ga-akọ ihe i kwuru.