1Nụrụnụ okwu ndị a nke Onyenwe anyị kwuru megide unu, unu ndị Izrel, megidekwa ezinaụlọ ahụ niile nke m kpọpụtara site nʼala Ijipt.2“Naanị unu ka m họọrọnʼime ezinaụlọ niile nke nọ nʼelu ụwa;Ọ bụ nʼihi nke a ka m ga-eji nye unu ahụhụnʼihi mmehie unu niile.”3Mmadụ abụọ ga-esi aṅaa jekọọ ijema ọ bụrụ na ha enweghị nkwekọrịta?4Ọdụm ọ na-agbọ ụja nʼọhịama ọ bụrụ na o nweghị anụ ọ hụrụ?Nwa ọdụm ọ na-ebigbọ nʼime olulu ya,mgbe ọ dịghị anụ ọ dọgburu?5Nnụnụ ọ na-ama nʼọnya dị nʼalama ọ bụrụ na o nweghị ọnya e siri ijide ya?Ọnya e siiri anụ ọ na-akụchima ọ bụrụ na o nweghị ihe ọ matara?6Mgbe a fụrụ opi nʼobodo,ọ bụ na ndị bi nʼime ya adịghị ama jijiji?Mgbe mbibi na ịla nʼiyi dakwasịrị obodo ọbụlaọ bụghị Onyenwe anyị mere ka ọ dị?7Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụlatutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi yandị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.8Ọdụm agbọọla ụja,o nwere onye na-agaghị atụ egwu?Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola okwu,onye ga-ahapụ ibu amụma?9Kwusaanụ ya nʼobodo niile e wusiri ike nke Ashdọdna ebe niile e wusiri ike nke Ijipt, sị,“Zukọtanụ nʼelu ugwu niile nke Sameriaka unu hụ oke ọgbaaghara nke dị nʼetiti yana mmegbu niile nke dị nʼetiti ndị ya. ”10“Ha echezọọla ime ezi ihe.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,“bụ ndị ahụ na-akpakọba ihe e zutere nʼohi na ihe e sitere nʼaka ike pụnara ndị mmadụnʼime nʼụlọ ha niile e wusiri ike.”11Nʼihi ya nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,“Onye iro na-abịa! Ọ ga-agba ala gị gburugburu;ọ ga-akwatu ebe niile gị bụ nke e wusiri ike,ma kwakọrọkwa ihe niile dị nʼụlọ gị ndị ahụ e wusiri ike.”12Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,“Dịka onye ọzụzụ atụrụ si anapụtanaanị ọkpụkpụ ụkwụ abụọ maọbụ iberibe ntị site nʼọnụ ọdụm,otu a ka a ga-esi zọpụta ụmụ Izrel bi na Sameria,na nkuku isi ihe ndinana nʼiberibe akwa ọma site nʼelu ihe ndina. ”13“Nụrụ nke a, ma gbaanụ ama megide ụmụ Jekọb,” ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri.14“Nʼụbọchị ahụ, m ga-enye Izrel ahụhụ nʼihi mmehie ha,aghaghị m imebikwa ebe ịchụ aja nke dị na Betel.Mpi dị nʼebe ịchụ aja ka a ga-ebipụkwa,mee ka ha daa nʼala.15Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi,na nke ha wuru maka oge okpomọkụ;aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo.Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.