1Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda.
Ikpe ọmụma dịrị ụwa niile nʼụbọchị nke Onyenwe anyị
2“Aga m azachapụ ihe niilesite nʼelu ụwa,”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.3“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ.Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe,zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri,na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.”“Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niilesite nʼelu ụwa,”otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ahụhụ dịrị Juda
4“Aga m esetipụ aka m megide Juda,megidekwa ndị niile bi na Jerusalem.Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a,na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,5bụ ndị ahụ niile na-anọ nʼelu ụlọ hana-akpọ isiala nye ọnwa na kpakpando,ha na ndị ahụ niile na-akpọrọ Onyenwe anyị isiala, na-eji aha ya nʼaṅụ iyi,ma na-ejikwa Milkọm na-aṅụ iyi,6na ndị ahụ niile na-alaghachi azụ site nʼiso Onyenwe anyị,na ndị ahụ na-adịghị achọ Onyenwe anyị, maọbụ jụta ase site nʼaka ya.”7Dere duu nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyịnʼihi na ụbọchị ikpe ya ahụ dị egwu na-abịa nso.Onyenwe anyị ejikerela ịchụ aja;o doola ndị ọ kpọrọ oriri nsọ.8“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ,aga m ata ndịisi niilena ụmụ eze niile,na ndị niile na-eyi uwee si na mba ọzọ bubata ahụhụ.9Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụbụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata,ndị ji ihe ike na aghụghọna-emejupụta ụlọ arụsị ha.10“Nʼụbọchị ahụ,”otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,“olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa,mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ,na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.11Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị;nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile.Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.12Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem.Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ,bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ,ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị,maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’13Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike,a ga-akwatukwa ụlọ ha niile.Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ,ma ha agaghị ebi nʼime ha;ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị,ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”
Ụbọchị ukwu nke Onyenwe anyị
14Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso,ọ na-abịakwa ọsịịsọ.Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu.A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.15Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma,ụbọchị ahụhụ na mkpagbu,ụbọchị nsogbu na mbibi,ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ,ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,16ụbọchị opi ike na iti mkpu aghaimegide obodo niile e wusiri ike,na imegide akụkụ ụlọ elu niile.17“Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ,mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì,nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị.A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu,tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.18Ọlaọcha na ọlaedo haagaghị azọpụta hanʼụbọchị ọnụma nke Onyenwe anyị ahụ.”A ga-erechapụ ụwa niilesite nʼọkụ ekworo ya,nʼihi na ọ bụ na mberedeka ọ ga-eme ka ndị niile bi nʼụwa gwụsịa.