Zekaraya9ibo_bib

Ikpe ọmụma megide ndị iro Izrel

1Okwu Amụma.Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak,na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike,nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niilena ebo niile nke Izrel dị.2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,tụkọba ọlaọcha dịka aja,na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwereọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya.Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị,ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda.Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,ka ndị iro ghara ịbata na ya.Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha,nʼihi na anọ m na nche ugbu a.

Ọbịbịa nke eze Zayọn

9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem!Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị,onye ezi omume na onye nwere mmeri,onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu,ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.10Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem,na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem;a ga-agbajikwa ụta agha.Ọ ga-ewetara mba niile udo,ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ,sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa.11Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha,nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara.12Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya.Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ.13Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m,tinye Ifrem dịka àkụ.Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn,ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis.Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha.

Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha,àkụ ya ga-efekwa dịka amụma.Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike,ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda.15Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha.Ha ga-ebibi,zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile.Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya;ha ga-ejupụta dịka efere,dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta.16Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya,dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya.Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịae tinyere nʼokpueze si na-egbuke.17Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma,mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.