Zekaraya10ibo_bib

Onyenwe anyị ga-elekọta Juda

1Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ,nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri.Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo,na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.2Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ,ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha,ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha,okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye.Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụa na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
3“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ,aga m atakwa ndị ndu niile ahụhụ;nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niilega-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda,ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.4A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ,a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu,a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha,sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.5Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha,ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile.Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha,ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.
6“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike,zọpụtakwa ụlọ Josef.Aga m eme ka ha lọghachita,nʼihi na aga m egosi ha obi ebere.Ha ga-adịka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla,nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha,aga m azakwa arịrịọ ha.7Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha,ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya.Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ,ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.8Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku,chịkọtaa ha.Nʼezie, aga m agbapụta ha,ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.9A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche,ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya.Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ;ha ga-alọtakwa.10Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha,sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha.Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn.Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.11Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee.A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ.Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa.A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa,wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.12Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị,ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.