Abụ nke Abụ8ibo_bib
1O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke;nke otu nne mụrụ mụ na yam gaara esutu gị ọnụmgbe anyị zutere nʼokporoụzọma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.2Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m,ka ị nọdụ nʼebe ahụ,nʼụlọ onye ziri m ihe.Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ,mmanya ụtọ nke pomegranet.3Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,aka nri ya na-ejikụ m.4Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi,unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya tetatupu ruo mgbe ọ masịrị ya.5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya.Onye a hụrụ nʼanyaNʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.6Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gịnʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,dịka ọkụ nke dị ukwu.7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.Ọ bụrụ na mmadụ ga-enyeakụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,a ga-eleda ya anya nke ukwuu.8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị ntama ọ kpụbeghị ara.Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.10Abụ m mgbidi,ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.Otu a ka m siri dị nʼanya yadịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.Onye ọbụla nʼime ha ga-ewetapuku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.12Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.13Gị onye bi nʼubi a gbara ogige,gị na ndị enyi gị,kwere ka m nụ olu gị.14Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya,bịakwute m dịka mgbada,maọbụ dịka nwa elena-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.