Abụ nke Abụ6ibo_bib

1Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom,ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere?Olee ụzọ o sitere?Ka anyị soro gị chọọ ya.2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige,nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ,ijegharị nʼetiti okoko urodi,na ịchịkọta okoko lili.3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem;Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.5Wepụ anya gị nʼebe m nọ,nʼihi na i jirila anya gị dọta m.Agịrị isi gị dị ka igwe ewunke na-arịdata site nʼugwu Gilead.6Eze gị dị ka igwe atụrụnke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gịdị ka pomegranet e kere abụọ.8E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii,na iri ndị iko nwanyị asatọ,na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ,9ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile.Naanị otu nwanyị nne ya nwere,ọ masịrị onye mụrụ ya.Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi,ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya.10Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ,nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ,dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị?11Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi,ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu,ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị,na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru.12Tupu m mata ebe m nọ,agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m.13Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ;laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya.Onye hụrụ ibe ya nʼanyaMaka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anyadịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?