Abụ nke Abụ3ibo_bib
1Achọrọ m onye m hụrụ nʼanyanʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya.Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya.2Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niilena nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya,m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya.Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya.3Ndị nche na-eche obodo hụrụ m,mgbe ha na-agagharị nʼobodo,ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?”4Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha,achọtara m onye m hụrụ nʼanya,ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya akatutu m duta ya nʼụlọ nne m,nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m.5Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị,unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya tetaruo mgbe o masịrị ya.6Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịadịka anwụrụ ọkụ,nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ,ụda nke ndị ahịa na-ere?7Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn.Iri mmadụ isii ndị ọka agha,ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya.8Ha niile ji mma agha;ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha.Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya,ịdị njikere maka ihe egwu abalị.9Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ anke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ.10Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee;ala ya bụkwa ọlaedo.Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa,e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya.Ndị inyom Jerusalem,11pụtanụ,bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn,bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze;lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi,nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya,nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.