Abụ nke Abụ2ibo_bib

1Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu.2E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu,otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ.3Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa,mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ.Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya,mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ.4Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri,ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya.5Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume;werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike,nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa.6Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m,aka nri ya na-ejikụ m.7Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem,eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị:Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta,ruo mgbe ọ masịrị ya.
8Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya!Lee ya ka ọ na-abịa,na-amali elu nʼelu ugwu niile,na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile.9Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele.Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị,ọ na-esikwa na oghereikukuna nʼoghere dị ya na-elebata anya.10Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m,“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ,onye m mara mma, soro m.11Lee, oge oyi agafeela,udu mmiri agabigakwala.12Okoko osisi epupụtala nʼala;oge eji agụ egwu eruokwala,a na-anụ abụ ndurunʼala anyị niile.13Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile.Bilie, ma bịa, ọmasịrị m.Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.”14Nduru m nọ nʼọgba nkume,nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu,gosi m ihu gị,mee ka m nụ olu gị,nʼihi na olu gị dị ụtọ,ihu gị makwara mma.15Jidenụ nkịta ọhịa,ụmụ nkịta ọhịa niilena-emebiri anyị ubi,ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko.16Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya.Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi,17tutu chi ụtụtụ abọọmgbe onyinyo niile na-agabigakwa.Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya,dị ka mgbadamaọbụ nwa elenke nọ nʼelu ugwu.