Abụ nke Abụ1ibo_bib

1Abụ nke abụ nke Solomọn.
2Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ,nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya.3Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma,aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta,ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya.4Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa.Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya.Ndị EnyiAnyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị.Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya.Onye a hụrụ nʼanyaLee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu.
5Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya,unu ụmụ agbọghọ Jerusalem.Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Kedadịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn.6Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji.Ọ bụ anwụ gbajiri m.Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m,zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị,ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị.7Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya,ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri?Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie?Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihunʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị.8Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma,soro nzọ ụkwụ igwe atụrụmeekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịadị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ.9Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnyae kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero.10Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma,olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma.11Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo,nke e ji ọlaọcha chọọ mma.12Mgbe eze nọ na tebul ya,mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile.13Onye m hụrụ dị m ka ụda máá e kechiri nʼakpanke dị nʼetiti ara m abụọ.14Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko hennanke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.15Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya.Leenụ ka ị si maa mma!Anya gị dịka nduru.16Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke.E, ị mara mma.Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ.17Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida,ntuhie ya bụkwa osisi fịa.