1Onyenwe anyị bụ eze,ka mba niile maa jijiji!O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim,ka elu ụwa maa jijiji.2Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn;ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche.3Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu,ọ dị nsọ.4Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya,i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike;nʼime Jekọb ka i mereihe ziri ezi na ihe dị mma.5Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu,feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya;ọ dị nsọ.6Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya,Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya;ha kpọkuru Onyenwe anyịọ zakwara ha.7Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii.Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha.8O Onyenwe anyị, Chineke anyị,ị zara ha;ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie,nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.9Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu;na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ,nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.