Abụ Ọma97ibo_bib

Chineke onye na-achị ihe niile

1Onyenwe anyị bụ eze, ka ụwa niile nwee obi ụtọ;ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.2Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu;ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.3Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu yaọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.4Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile;ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.5Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị,nʼihu Onyenwe ụwa niile.6Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya;ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.
7A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe,ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka meefeenụ ya ofufe, unu chi niile!
8Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ,obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọnʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.9Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile;ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.10Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị,nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obima na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.11Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume,ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.12Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume,tookwanụ aha nsọ ya.