1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ,o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị.2Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa;kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha.3Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe?Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ?4Ha na-ekwuwapụ okwu mpako;ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ.5Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị;ha na-emegbu ihe nketa gị.6Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa;ha na-egbu ndị na-enweghị nna.7Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a;Chineke Jekọb na-agba nkịtị.”8Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m;unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?9Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe?Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ?10Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ?Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma?11Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ;ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi.12Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị,onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị;13ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu;tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu.14Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya;ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ.15Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile;ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya.16Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume?Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe?17A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka,agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.18Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,”ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m.19Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m,nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ.20A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ,nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya?21Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omumena-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ.22Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m,na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ.23Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha,lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha;Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.