Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra.
Akwa maka enyemaka
1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m,nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.2Ka ekpere m bịa nʼihu gị.Chee ntị gị nụrụ akwa m.3Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m,anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ.4Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu.Adị m dịka onye na-enweghị ike.5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche,dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili,ndị ị nakwaghị echeta ọzọ,ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi,olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ.Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị;ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,10ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị?Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela11Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị?A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?12A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị?Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?13Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku.Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.14O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m?Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?15Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso;ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.16Oke iwe gị agabigala nʼahụ m;ihe egwu gị alaala m nʼiyi.17Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri;ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.18Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya;ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.