Abụ Ọma85ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora.

Ekpere maka ihuọma

1O Onyenwe anyị, i gosila ala gị ihuọma;i nyeghachila Jekọb akụnụba ya.2I gbagharala ajọ omume ndị gị,kpuchikwaa mmehie ha niile. Sela3Ị kwụsịla iwe oke iwe gị,I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa.
4Kpọghachi anyị azụ, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ.5Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe:Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?6Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị?7O Onyenwe anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide,nyekwa anyị nzọpụta gị.
8Aga m ege ntị mara ihe Chineke, onye bụ Onyenwe anyị ga-ekwu;ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo,ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu.9Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya,ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị.
10Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala;ezi omume na udo esutula ọnụ.11Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta,ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya.12Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma,ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya.13Ezi omume ga-aga nʼihu ya,idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.