1Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu;ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile.2Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Sela3Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi;hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha.4Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa;napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume.5Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla.Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị;ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.6“Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,”unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke Onye kachasị ihe niile elu.’7Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ;unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.”8O Chineke, bilie kpee ụwa ikpe,nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.