1O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị;ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị,ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu.2Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigweka ọ bụrụ ihe oriri nye ha,werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa.3Ha awụpụla ọbara dịka mmirinʼakụkụ niile nke Jerusalem,ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ.4Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ,ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo.5O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi?Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ?6Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gịdịka Chineke oke iwe gị,bụ alaeze niile ndị ahụna-adịghị akpọku aha gị;7nʼihi na ha eripịala Jekọbmekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu.8Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere;ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị,nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa.9Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị,nʼihi ebube nke aha gị;napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niilenʼihi aha gị.10Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị,“Olee ebe Chineke ha nọ?”Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ,na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru.11Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ;site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ.12Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyịnʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị.13Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gịga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi;anyị ga na-ekwupụta otuto gị,site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.