Abụ Ọma77ibo_bib

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma.

Nkasiobi nʼoge nsogbu

1Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.2Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị,mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
3O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela4I kweghị ka anya m abụọ mechie;nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.5Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,na afọ niile ndị gara aga.6Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
7“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?8Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?9Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” Sela
10Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m,afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.11Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.12Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
13O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?14Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.15I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela
16Osimiri hụrụ gị, O Chineke,osimiri hụrụ gị, taa;ogbu mmiri mere mkpọtụ.17Igwe ojii wụpụrụ mmiri,mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe;àkụ gị gburu amụma ebe niile.18A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,amụma gị nyere ụwa niile ihe;elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.19Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri,ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
20I sitere nʼaka Mosis na Erọnduo ndị gị dịka igwe atụrụ.