Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.
Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke
1Anyị na-eto gị, O Chineke.Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.2Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka.Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.3Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji,ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. Sela4Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ,nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu.5Unu ewelila mpi unu megide eluigwe;unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”6Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ,maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.7Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe;ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.8Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyịnke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwana-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.9Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,10bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”