1Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,dịkwara ndị obi ha dị ọcha.2Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ,ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.3Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo ;mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.4Ha anaghị adọgbu onwe ha;ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.5Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha.Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.6Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha;ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.7Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta;echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.8Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu;nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.9Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha,ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.10Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha,na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.11Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara?Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”12Otu a ka ndị ajọ omume dị,ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha,nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.14Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu;ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.15Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,”agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.16Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile,ọ ghọọrọ m ihe mwute,17tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke;mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.18Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị;ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.19Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya,bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!20Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta,otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara,ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.21Mgbe m nọ nʼobi mwute;mmụọ m dara mba.22Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe.Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.23Ma ana m anọnyere gị mgbe niile;ị na-ejide m nʼaka nri m.24Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.25Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị?Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.26Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,ma Chineke bụ ike nke obi m,na ihe nketa m ruo ebighị ebi.27Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi.Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.28Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso.Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m.Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.