1O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.Nyekwa nwa eze ezi omume gị.2Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.3Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.4Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;ọ ga-egwepịa onye mmegbu.5Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.6Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.7Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.8Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,na-esite nʼiyi ukwu. ruo na nsọtụ niile nke ụwa9Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.10Ndị eze Tashish na mba niile dị nʼebe dị anya,ga-atụ ụtụ wetara ya;e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba,ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.11Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,mba niile ga-ejekwara ya ozi.12Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.13Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.14Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.15Ka ọ dị ogologo ndụ!Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.16Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.17Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.A ga-esite na ya gọzie mba niile,a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.18Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.19Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.Amen na Amen.20Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.