Abụ Ọma71ibo_bib

Ekpere maka ndụ ogologo

1Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ;ekwela ka ihere mee m.2Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m;tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.3Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla;nye iwu maka nzọpụta m,nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.4O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ,ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.
5Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị,ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.6Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m;gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m.Aga m anọgide na-eto gị.7Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ,ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.8Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
9Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi;ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.10Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m;ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.11Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ;chụọ ya ọsọ, jidekwa ya,nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”12O Chineke, anọla m ebe dị anya;O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.13Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha;ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchindị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.
14Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.
15Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gịna nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.16Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.17O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.18O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.
19O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.O Chineke, onye dị ka gị?20Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbunke dị ilu,ị ga-atụte ndụ m ọzọ;site nʼebe dị omimi nke ụwa,ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.21Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
22O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị,nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị;aga m eji une bụkuo gị abụ otuto,gị Onye nsọ nke Izrel.23Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụmgbe m na-abụku gị abụ otuto,mụ, onye ị gbapụtara.24Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụtaọrụ ezi omume gị niile,nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ,ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.