1O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m,O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.2Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi mlaghachi azụ nʼihere.3Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!”laghachi azụ nʼihi ihere ha.4Ma ka ndị niile na-achọ gịṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị,ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,“Onyenwe anyị dị ukwuu.”5Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa;O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m.Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.