Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin.
Arịrịọ maka ikpe ziri ezi
1Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara;zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm,ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a;ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ,maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m;ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m,mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị,bilie megide oke iwe ndị iro m;teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu,ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe.Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị,na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.9O Chineke onye ezi omume,onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ,mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebemeekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m,ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi,Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.12Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị,ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ,ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.13Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ;ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.14Onye ọbụla dị ime ajọ ihe,na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.15Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adabanʼime olulu ahụ o gwuru.16Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị yaihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.17Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.