1O Chineke, zọpụta m,nʼihi na mmiri abịaruola m nʼolu.2Ana m emikpu nʼụrụrọ ebe dị omimi,e nwekwaghị ebe ịzọkwasị ụkwụ dị.Abịala m nʼebe mmiri dị omimi;uju mmiri na-achọkwa ikpuchigide m.3Akpịrị akpọọla m nkụ;ike agwụla m ebe m na-akpọ oku maka enyemaka.Anya m agbaala ọchịchịrịebe m na-ele anya Chineke.4Ndị kpọrọ m asị nʼefu dị ukwuukarịa agịrị isi dị m nʼisi.Ndị na-achọ ịla ndụ m nʼiyi dị ukwuu,bụ ndị họọrọ ịbụ ndị iro m, mgbe ọ na-adịghị ihe ọbụla m mere ha.Ha nọgidesịrị m ike mee ka m nyeghachiihe m na-ezughị nʼohi.5Gị, Chineke, ị maara enweghị uche m niile;ikpe ọmụma m abụghị ihe zoro ezo nʼihu gị.6Ekwela ka ihere mee ndịna-atụkwasị gị obi nʼihi m,O Onyenwe m, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;ka ndị na-achọ gịghara ịbụ ndị a ga-eme ihe ihere nʼihi m,O Chineke nke Izrel.7Ọ bụ nʼihi gị ka m na-anagide ịkwa emo,ihere ekpuchiela m ihu.8Abụ m ọbịa nʼebe ụmụnna m nọ,nʼebe ụmụnne nọ, abụ m onye mba ọzọ.9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi,ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ,ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.11Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m,a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ,abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere,nʼoge ihuọma gị;na oke ịhụnanya gị, O Chineke m,zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.14Dọpụta m site nʼụrụrọ,ekwela ka m mikpuo;zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị,site na mmiri miri emi.15Ekwela ka uju mmiri kpuchie m,maọbụ ka ebe dị omimi loda m,ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya.16O Onyenwe anyị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị,nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu.17Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị.Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m!18Bịa m nso zọpụta m.Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.19Ị maara ihe niile banyere ihe ọchị ha ji m mee, mweda nʼala m na ihe ihere:ndị iro m niile nọkwa gị nʼihu.20Ọchị ha na-achị m etiwaala m obi,ma hapụ m nʼọnọdụ enweghị inyeaka.Elere m anya onye ga-emere m ebere, ma ọ dịghị onye ọbụla m hụrụ;lee anya ndị ga-akasị m obi, ma ọ dịkwaghị onye m chọtara.21Ha tinyere oluilu nʼime nri m,nyekwa m mmanya gbara ụka ka m ṅụọ.22Ka tebul e debere nʼihu ha ghọrọ ha ọnya;ka ọ bụrụ ha ihe ịbọ ọbọ mgbe ha nọ nʼudo ya ghọrọ ha ọnya igbudu.23Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha gharakwa ịhụ ụzọ ọzọ,mekwa ka ụkwụ ha na-ama jijiji mgbe niile.24Wụkwasị ha oke iwe gị,ka iwe gị dị ọkụ zute ha.25Ka ebe obibi ha tọgbọrọ nʼefu,ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ụlọ ikwu ha.26Ha na-akpagbu ndị ahụ i merụrụ ahụ,na-ekwukwa banyere ihe mgbu ndị ahụ i kwohịara ahụ.27Boo ha ebubo ajọ omume tụkwasị nʼelu ajọ omume,ekwekwala ka ha keta oke na ezi omume gị.28Mee ka e hichapụ aha ha site nʼakwụkwọ nke ndụ,ka a hapụ idekọta aha ha na nke ndị ezi omume.29Anọ m nʼụfụ na ihe mgbu,O Chineke, mee ka nzọpụta gị kpuchie m.30Aga m eji ịbụ abụ too aha Chineke,jirikwa ekele bulie ya elu.31Nke a ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ karịa oke ehi,karịa oke ehi, nke mpi ya na ụkwụ ya ka dị.32Ndị ogbenye ga-ahụ ya ma ṅụrịakwa ọṅụ;unu ndị na-achọ Chineke, ka obi unu na-adị ndụ.33Onyenwe anyị na-anụ ekpere ndị nọ na mkpa,ọ naghị eledakwa ndị ya a dọtara nʼagha anya.34Ka eluigwe na ụwa too ya,osimiri niile na ihe niile bi nʼime ha.35Nʼihi na Chineke ga-azọpụta Zayọn;ọ ga-ewugharị obodo niile nke Juda.Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ebi nʼime ya, mee ya ihe nweta ha.36Ụmụ ndị na-ejere ya ozi ga-eketa ya,ndị hụrụ aha ya nʼanya ga-ebikwa ebe ahụ nʼime ya.