1Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị,ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Sela2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa,marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.3Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;ka mmadụ niile too gị.4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ,nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ,na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela5Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;ka mmadụ niile too gị.6Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya,Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.7Chineke ga-agọzi anyị,nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.