1Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!2Bụọ abụ banyere ebube aha ya;meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!3Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!Ike gị dị nnọọ ukwu,ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.4Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;ha na-abụku gị abụ otuto,ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Sela5Bịa lee ihe Chineke mere,ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ!6O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee ;bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.7Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya,anya ya na-elekwa mba niile,ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Sela8Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile,kwere ka a nụ ụda otuto ya;9O chebela ndụ anyị,ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ.10Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị;ị nụchara anyị dịka ọlaọcha.11Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ,ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị.12I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu;anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee.Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile.13Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị,imezu nkwa m kwere gị14nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo,ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m.15Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja,ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule;Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Sela16Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke;ka m kọọrọ unu ihe o meere m.17Eji m ọnụ m kpọkuo ya;otuto ya dị m nʼire.18Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m,Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;19ma Chineke gere ntị nʼezie,nụrụkwa olu arịrịọ m.20Otuto dịrị Chineke,onye na-ajụghị ekpere mmaọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!