Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid.
Ịnọgide nʼokwukwe
1Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike.Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa.2Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m;ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.3Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a?Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya,ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo?4Ha ekpebielaisite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya;okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi,ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. Sela5O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;olileanya m na-esite na ya na-abịa.6Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.7Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.8Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;kwupụtaranụ ya obi unu,nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela9Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume,ndị ukwu bụ naanị ụgha;ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu;ha niile bụ naanị otu nkuume.10Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego,maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu;akụ unu nwere ike mụbaa,unu atụkwasịla ha obi.11Chineke ekwuola otu ihe,ihe abụọ ka m nụrụ:“Na gị, O Chineke, dị ike,12na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya.Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụladịka ọrụ ya si dị.”